Native Bible

Psalms 63:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

Psalms 63:4 in English

Psalms 63:4 · Berean Standard Bible

So I will bless You as long as I live; in Your name I will lift my hands.

Context

2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. 3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.