Native Bible

Psalms 63:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

Psalms 63:3 in English

Psalms 63:3 · Berean Standard Bible

Because Your loving devotion is better than life, my lips will glorify You.

Context

1O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. 3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.