Native Bible

Psalms 63:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

Psalms 63:7 in English

Psalms 63:7 · Berean Standard Bible

For You are my help; I will sing for joy in the shadow of Your wings.

Context

5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. 7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. 8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m. 9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.