Native Bible

Psalms 64 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 64
1Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m. 2Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe. 3Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ. 4Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu. 5Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya*?” 6Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ. 7Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha. 8Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo. 9Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere. 10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya. 64:5 Maọbụ, onye ga-ahụ anyị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.