Abụ Ọma 62
Psalms 62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.
Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa. 2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;
ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?
Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,
ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo? 4Ha ekpebiela
isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;
okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.
Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,
ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela 5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,*
Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela 9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,
ndị ukwu bụ naanị ụgha;
ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;
ha niile bụ naanị otu nkuume. 10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,
maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;
akụ unu nwere ike mụbaa,
unu atụkwasịla ha obi. 11Chineke ekwuola otu ihe,
ihe abụọ ka m nụrụ:
“Na gị, O Chineke, dị ike, 12na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya.
Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla
dịka ọrụ ya si dị.”
62:7 Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.