Abụ Ọma 62:8
Psalms 62:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
Psalms 62:8 in English
Psalms 62:8 · Berean Standard Bible
Trust in Him at all times, O people; pour out your hearts before Him. God is our refuge. Selah
Context
6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,*
Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela 9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,
ndị ukwu bụ naanị ụgha;
ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;
ha niile bụ naanị otu nkuume. 10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,
maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;
akụ unu nwere ike mụbaa,
unu atụkwasịla ha obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.