Native Bible

Psalms 62:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

Psalms 62:6 in English

Psalms 62:6 · Berean Standard Bible

He alone is my rock and my salvation; He is my fortress; I will not be shaken.

Context

4Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela 5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,* Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.