Abụ Ọma 62:4
Psalms 62:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela
Psalms 62:4 in English
Psalms 62:4 · Berean Standard Bible
They fully intend to cast him down from his lofty perch; they delight in lies; with their mouths they bless, but inwardly they curse. Selah
Context
2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;
ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?
Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,
ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo? 4Ha ekpebiela
isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;
okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.
Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,
ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela 5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.