Abụ Ọma 62:3
Psalms 62:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?
Psalms 62:3 in English
Psalms 62:3 · Berean Standard Bible
How long will you threaten a man? Will all of you throw him down like a leaning wall or a tottering fence?
Context
1Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.
Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa. 2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;
ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?
Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,
ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo? 4Ha ekpebiela
isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;
okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.
Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,
ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela 5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.