Abụ Ọma 62:7
Psalms 62:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,* Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
Psalms 62:7 in English
Psalms 62:7 · Berean Standard Bible
My salvation and my honor rest on God, my strong rock; my refuge is in God.
Context
5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,*
Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela 9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,
ndị ukwu bụ naanị ụgha;
ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;
ha niile bụ naanị otu nkuume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.