Native Bible

Psalms 62:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.

Psalms 62:10 in English

Psalms 62:10 · Berean Standard Bible

Place no trust in extortion, or false hope in stolen goods. If your riches increase, do not set your heart upon them.

Context

8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela 9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume. 10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi. 11Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike, 12na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.” 62:7 Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.