Abụ Ọma 61
Psalms 61 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nụrụ akwa m, O Chineke,
gee ntị nʼekpere m. 2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu. 3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,
na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.* 4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,
ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela 5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;
i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị. 6Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,
mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ. 7Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya. 8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
61:3 Ilu 18:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.