Abụ Ọma 60
Psalms 60 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;
i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị. 2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji. 3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,*
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;*
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m. 8Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm? 10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 11Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 12Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6
60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.