Native Bible

Psalms 60:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.

Psalms 60:5 in English

Psalms 60:5 · Berean Standard Bible

Respond and save us with Your right hand, that Your beloved may be delivered.

Context

3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;* Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.