Native Bible

Psalms 60:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;* Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.

Psalms 60:7 in English

Psalms 60:7 · Berean Standard Bible

Gilead is Mine, and Manasseh is Mine; Ephraim is My helmet, Judah is My scepter.

Context

5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;* Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m. 8Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.