Native Bible

Psalms 60:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.

Psalms 60:6 in English

Psalms 60:6 · Berean Standard Bible

God has spoken from His sanctuary:* “I will triumph! I will parcel out Shechem and apportion the Valley of Succoth.

Context

4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;* Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m. 8Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.