Native Bible

Psalms 60:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”

Psalms 60:8 in English

Psalms 60:8 · Berean Standard Bible

Moab is My washbasin; upon Edom I toss My sandal; over Philistia I shout in triumph.”

Context

6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7Gilead bụ nke m,* otu a kwa, Manase bụkwa nke m;* Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m. 8Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm? 10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.