Native Bible

Psalms 60:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

Psalms 60:10 in English

Psalms 60:10 · Berean Standard Bible

Have You not rejected us, O God? Will You no longer march out, O God, with our armies?

Context

8Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm? 10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 11Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 12Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala. 60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6 60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32 60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.