Native Bible

Psalms 60:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela

Psalms 60:4 in English

Psalms 60:4 · Berean Standard Bible

You have raised a banner for those who fear You, that they may flee the bow.* Selah

Context

2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji. 3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.