Abụ Ọma 60:4
Psalms 60:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela
Psalms 60:4 in English
Psalms 60:4 · Berean Standard Bible
You have raised a banner for those who fear You, that they may flee the bow.* Selah
Context
2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji. 3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,*
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.