Native Bible

Psalms 61:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.*

Psalms 61:3 in English

Psalms 61:3 · Berean Standard Bible

For You have been my refuge, a tower of strength against the enemy.

Context

1Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m. 2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu. 3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.* 4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela 5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.