Abụ Ọma 130
Psalms 130 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m.
Ka ntị gị na-aṅakwa ntị
nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,
Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie* dị;
ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel
site na mmehie ya niile.
130:4 Ọpụ 34:7; Neh 9:17; Dan 9:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.