Native Bible

Psalms 130 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 130
1O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie* dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile. 130:4 Ọpụ 34:7; Neh 9:17; Dan 9:9

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.