Abụ Ọma 129
Psalms 129 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ka Izrel kwuo. 2“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ma ha enweghị ike merie m. 3Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,
mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo. 4Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;
ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.” 5Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị
bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere. 6Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ
nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;* 7nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,
maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya. 8Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,
“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.
Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”*
129:6 Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2
129:8 Rut 2:4
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.