Abụ Ọma 130:5
Psalms 130:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
Psalms 130:5 in English
Psalms 130:5 · Berean Standard Bible
I wait for the LORD; my soul does wait, and in His word I put my hope.
Context
3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,
Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie* dị;
ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.