Abụ Ọma 130:7
Psalms 130:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
Psalms 130:7 in English
Psalms 130:7 · Berean Standard Bible
O Israel, put your hope in the LORD, for with the LORD is loving devotion, and with Him is redemption in abundance.
Context
5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel
site na mmehie ya niile.
130:4 Ọpụ 34:7; Neh 9:17; Dan 9:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.