Native Bible

Psalms 131 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 131
1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m. 2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m. 3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị* ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. 131:3 Abụ 130:7

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.