Native Bible

Psalms 113 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 113
1Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị. 2Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. 3Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto. 4Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe. 5Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, 6onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya? 7Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu; 8ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ. 9Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.