Abụ Ọma 112
Psalms 112 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Toonu Onyenwe anyị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;
onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;
ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,
nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,
onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;
a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;
obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;
nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,
ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu. 10Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,
ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;
olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.