Abụ Ọma 112:8
Psalms 112:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
Psalms 112:8 in English
Psalms 112:8 · Berean Standard Bible
His heart is assured; he does not fear, until he looks in triumph on his foes.
Context
6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;
a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;
obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;
nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,
ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu. 10Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,
ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;
olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.