Abụ Ọma 112:3
Psalms 112:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
Psalms 112:3 in English
Psalms 112:3 · Berean Standard Bible
Wealth and riches are in his house, and his righteousness endures forever.
Context
1Toonu Onyenwe anyị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;
onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;
ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,
nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,
onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.