Native Bible

Psalms 114 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 114
1Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta, 2Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị. 3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,* osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ*; 4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ. 5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ? 6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ? 7Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb, 8onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.* 114:3 Ọpụ 14:21 114:3 Jos 3:12-16 114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.