Proverbs 14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,
ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. 2Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị;
ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 3Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako,
ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 4Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha,
ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 5Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ,
ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 6Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya;
ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. 7Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị,
nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. 8Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,
ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. 9Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;
ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,
ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,
ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,
ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. 14Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,
ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. 15Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;
ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. 16Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ,
ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 17Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu,
ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. 18Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ,
ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. 19Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ,
ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 20Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị,
ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 21Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie,
ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 22Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu?
Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;
ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha,
ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,
ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;
nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 27Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 28Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,
e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,
ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. 30Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;
ekworo na-eme ka o ree ure. 31Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya,
ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. 32Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke,
ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. 33Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide,
ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. 34Ezi omume na-ewuli mba elu,
ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. 35Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe;
ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.