Native Bible

Proverbs 14:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.

Proverbs 14:4 in English

Proverbs 14:4 · Berean Standard Bible

Where there are no oxen, the manger is empty, but an abundant harvest comes through the strength of the ox.

Context

2Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 3Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 4Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 5Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 6Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.