Native Bible

Proverbs 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.

Proverbs 14:21 in English

Proverbs 14:21 · Berean Standard Bible

He who despises his neighbor sins, but blessed is he who shows kindness to the poor.

Context

19Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 20Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 21Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 22Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.