Ilu 14:27
Proverbs 14:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
Proverbs 14:27 in English
Proverbs 14:27 · Berean Standard Bible
The fear of the LORD is a fountain of life, turning a man from the snares of death.
Context
25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,
ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;
nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 27Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 28Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,
e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,
ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.