Native Bible

Proverbs 14:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.

Proverbs 14:25 in English

Proverbs 14:25 · Berean Standard Bible

A truthful witness saves lives, but one who utters lies is deceitful.

Context

23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 27Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.