Native Bible

Proverbs 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.

Proverbs 14:24 in English

Proverbs 14:24 · Berean Standard Bible

The crown of the wise is their wealth, but the effort of fools is folly.

Context

22Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.