Ilu 14:13
Proverbs 14:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
Proverbs 14:13 in English
Proverbs 14:13 · Berean Standard Bible
Even in laughter the heart may ache, and joy may end in sorrow.
Context
11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,
ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,
ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. 14Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,
ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. 15Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;
ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.