Native Bible

Proverbs 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.

Proverbs 14:11 in English

Proverbs 14:11 · Berean Standard Bible

The house of the wicked will be destroyed, but the tent of the upright will flourish.

Context

9Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.