Ilu 14:11
Proverbs 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.
Proverbs 14:11 in English
Proverbs 14:11 · Berean Standard Bible
The house of the wicked will be destroyed, but the tent of the upright will flourish.
Context
9Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;
ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,
ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,
ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,
ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.