Ilu 14:10
Proverbs 14:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.
Proverbs 14:10 in English
Proverbs 14:10 · Berean Standard Bible
The heart knows its own bitterness, and no stranger shares in its joy.
Context
8Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,
ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. 9Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;
ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,
ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,
ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.