Proverbs 15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;
ma okwu ike na-akpali iwe. 2Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,
ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche. 3Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,
anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ. 4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;
ma nkwutọ na-eweta ịda mba. 5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;
ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche. 6Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,
ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu. 7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,
ma obi ndị nzuzu ezighị ezi. 8Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,
ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ. 9Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,
ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya. 10Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.
Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ. 11Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;
ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? 12Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,
ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe. 13Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.
Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute. 14Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,
ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru. 15Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,
ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile. 16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,
karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu. 17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,
karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya. 18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;
ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị. 19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,
ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị. 20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,
ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya. 21Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,
ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi. 22Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,
ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị. 23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,
okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma. 24Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,
iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. 25Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,
ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta. 26Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị
ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya. 27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.
Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ. 28Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya
ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche. 29Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;
ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume. 30Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.
Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ. 31Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ
ga-esoro ndị amamihe nọrọ. 32Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị
ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta. 33Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;
onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.