Native Bible

Proverbs 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.

Proverbs 15:5 in English

Proverbs 15:5 · Berean Standard Bible

A fool rejects his father’s discipline, but whoever heeds correction is prudent.

Context

3Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ. 4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba. 5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche. 6Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu. 7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.