Proverbs 16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,
ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị. 2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,
ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ. 3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,
ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu. 4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,
o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi. 5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.
Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ. 6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;
ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie. 7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo. 8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume
karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi. 9Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,
maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị. 10Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,
ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. 11Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,
ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha. 12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,
nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike. 13Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,
ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ. 14Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.
Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ. 15Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,
ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.* 16Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo. 17Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,
ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha. 18Nganga na-eweta ịla nʼiyi,
mpako na-ewetakwa ọdịda. 19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,
na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha. 20Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,
onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 21A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.
Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma. 22Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,
ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ. 23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,
egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu. 24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,
ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike. 25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;
agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu. 27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,
egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ. 28Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;
ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi. 29Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,
na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi. 30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,
onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie. 31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,
a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume. 32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.
Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha. 33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,
maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
16:15 Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.