Ilu 16:14
Proverbs 16:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
Proverbs 16:14 in English
Proverbs 16:14 · Berean Standard Bible
The wrath of a king is a messenger of death, but a wise man will pacify it.
Context
12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,
nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike. 13Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,
ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ. 14Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.
Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ. 15Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,
ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.* 16Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.