Native Bible

Proverbs 16:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

Proverbs 16:32 in English

Proverbs 16:32 · Berean Standard Bible

He who is slow to anger is better than a warrior, and he who controls his temper is greater than one who captures a city.

Context

30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie. 31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume. 32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha. 33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ. 16:15 Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.