Native Bible

Proverbs 15:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.

Proverbs 15:18 in English

Proverbs 15:18 · Berean Standard Bible

A hot-tempered man stirs up strife, but he who is slow to anger calms dispute.

Context

16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu. 17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya. 18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị. 19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị. 20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.