Aịzaya 26
Isaiah 26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:
Anyị nwere obodo e wusiri ike.
Chineke na-eme ka mgbidi ya
na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị. 2Meghee ụzọ ama niile,
ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,
e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi. 3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike
nwee udo zuruoke,
nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha. 4Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi. 5Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,
na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.
Mgbidi ya
ka ọ na-eme ka ọ daruo ala. 6Ọ na-enyefe obodo ahụ
nʼaka ndị a na-emegbu emegbu,
na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ. 7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,
gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị. 8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,
na-ele anya gị.
Aha gị na ihe niile e ji mara gị
bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike. 9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,
nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,
nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe
ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe. 10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ
adịghị eme ka ha gbanwee.
Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.
Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,
ha adịghị ahụ ya.
Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.
E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha. 12Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo;
nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị. 13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,
ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe. 14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;
mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.
Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;
e chefukwaala ha. 15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;
i meela ka mba a saa mbara.
I wetarala onwe gị nsọpụrụ,
i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa. 16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.
Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,
ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere. 17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,
dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.
Otu a ka anyị nọ nʼihu gị. 18Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,
ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.
Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.
O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara. 19Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị.
Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie.
Unu ndị niile bi nʼaja
tetanụ ma tie mkpu ọṅụ.
Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ,
ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ. 20Baanụ nʼụlọ, ndị m,
kpọchienụ ụzọ unu!
Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta,
tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga. 21Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya
na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile.
Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya,
ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.