Native Bible

Isaiah 26:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.

Isaiah 26:21 in English

Isaiah 26:21 · Berean Standard Bible

For behold, the LORD is coming out of His dwelling to punish the inhabitants of the earth for their iniquity. The earth will reveal her bloodshed and will no longer conceal her slain.

Context

19Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ. 20Baanụ nʼụlọ, ndị m, kpọchienụ ụzọ unu! Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta, tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga. 21Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.