Aịzaya 25
Isaiah 25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;
aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,
nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,
ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,
nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga. 2Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe;
mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ;
meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi,
agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi. 3Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị.
Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu. 4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;
ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,
ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,
na ndo nʼoge okpomọkụ.
Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere
dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi, 5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.
Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,
dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,
otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị. 6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.
Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.
Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,
nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,
nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile
site nʼihu mmadụ niile,
ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile
dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.
Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,
“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,
anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.
Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,
ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,
ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,
dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ. 11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,
dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,
ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,
nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha. 12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,
mee ka ha daruo ala,
ọ ga-eme ka ha daruo ala,
ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.
25:8 Maọbụ, Ihe ihere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.