Aịzaya 25:10
Isaiah 25:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
Isaiah 25:10 in English
Isaiah 25:10 · Berean Standard Bible
For the hand of the LORD will rest on this mountain. But Moab will be trampled in his place as straw is trodden into the dung pile.
Context
8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile
site nʼihu mmadụ niile,
ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile
dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.
Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,
“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,
anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.
Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,
ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,
ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,
dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ. 11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,
dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,
ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,
nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha. 12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,
mee ka ha daruo ala,
ọ ga-eme ka ha daruo ala,
ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.
25:8 Maọbụ, Ihe ihere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.