Aịzaya 25:11
Isaiah 25:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya, dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya, ma Chineke ga-eweda mpako ha niile, nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.
Isaiah 25:11 in English
Isaiah 25:11 · Berean Standard Bible
He will spread out his hands within it, as a swimmer spreads his arms to swim. His pride will be brought low, despite * the skill of his hands.
Context
9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,
“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,
anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.
Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,
ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,
ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,
dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ. 11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,
dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,
ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,
nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha. 12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,
mee ka ha daruo ala,
ọ ga-eme ka ha daruo ala,
ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.
25:8 Maọbụ, Ihe ihere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.